[go: nahoru, domu]

Jump to content

Iwu Nri

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Iwu Nri bụ mpaghara nke Iwu ọha na eze gbasara otu esi emepụta nri, nhazi, kesaa, zụta, ma ọ bụ nye ya. A n'emepụta ụkpụrụ nri iji metụta ọrụ nke usoro nri na ọrụ ugbo nke kwụsiri ike iji hụ na mkpa ahụike mmadụ. Nke a n'agụnyekarị mkpebi gbasara usoro mmepụta na nhazi, ahịa, nnweta, ojiji, na oriri nke nri, maka ọdịmma nke izute ma ọ bụ ịkwalite ebum n'uche mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Enwere ike iwepụta iwu nri na ọkwa ọ bụla, site na mpaghara rụo n'ụwa niile, ya na ụlọ ọrụ gọọmentị, azụmaahịa, ma ọ bụ nzukọ. Ndị n'eme iwu nri n'etinye aka n'ihe omume ndị dị ka ịchịkwa ụlọ ọrụ ndị metụtara nri, n'eguzobe ụkpụrụ iru eru maka mmemme enyemaka nri maka ndị ogbenye, n'ahụ maka nchekwa nke nri, akara nri, na ọbụna iru eru nke ngwa ahịa a ga-ewere dị ka ihe dị ndụ.

Picture of hands holding rice.
Osikapa

A na-amalite ọtụtụ iwu nri na mpaghara ụlọ maka ebum n'uche nke ijide n'aka na nri zuru oke maka ụmụ amaala.[1] Na Mba na-emepe emepe, e nwere ebum n'uche atọ maka iwu nri: ichebe ndị ogbenye pụọ na nsogbụ, ịzụlite ahịa ogologo oge nke n'eme ka ojiji nke ihe onwunwe dị mma, ya na ịbawanye mmepụta nri nke ga-akwalite mmụba nke ego.

Iwu nri n'agụnye ụsoro nke gọọmentị n'ekwu maka ma ọ bụ n'achịkwa ihe gbasara nri, gụnyere ndị otu mba ụwa ma ọ bụ netwọk, ya na ụlọ ọrụ ọha na eze ma ọ bụ ụlọ ọrụ onwe. Ndị n'arụ ọrụ ụgbo n'ebukarị ibu arọ nke ọchịchọ gọọmentị ime ka ọnụahịa nri dị ala iji mee ka ọnụ ọgụgụ ndị bi n'obodo ukwu na-eto eto. Ọnụahịa dị ala maka ndị n'azụ ahịa nwere ike ịbụ ihe n'egbochi ndị ọrụ ugbo imepụta nri karịa, n'akpatakarị agụụ, atụmanya azụmaahịa n'adịghị mma, na mkpa dị ukwuu maka mbubata nri.[1]

Na mba mepere emepe dịka United States, a ghaghị ile iwu nri na nri n'edozi ahụ anya n'ihe gbasara nchegbu akụ na ụba mpaghara na nke mba, nrụgide gburugburu ebe obibi, nlekọta nke netwọk nchekwa ọha na eze, ahụike, agbamume nke ụlọ ọrụ onwe na ihe ọhụrụ, na ala ugbo nke obere, nnukwu ugbo.[2] Mba ndị mepere emepe n'agba mbọ ịhụ na ndị ọrụ ugbo n'enweta ego siri ike n'agbanyeghị mgbanwe ọnụahịa na nnyefe na ọnọdụ ihu igwe n'adịghị mma. A n'enyefe ndị n'azụ ahịa ego a na-akwụ maka ego a n'enweta n'ugbo n'ụdị ọnụahịa nri dị elu.[1]

  1. 1.0 1.1 1.2 Fischer, G. (1988). Linked National Models: A Tool for International Policy Analysis. The Netherlands: Kluwer Academic Publishers. ISBN 978-9024737345.  Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "Linked National Models" defined multiple times with different content
  2. Wilde (2013). Food Policy in the United States: An Introduction. London and New York: Routledge Taylor & Francis Group. ISBN 978-1-84971-428-0.